NNYOCHA OMENAALA NA NKWENYE NDỊ IGBO KA HA SI PỤTA IHE EJIJE NWATA BỤLIE NNA YA ELU
Abstract
Ndị Igbo tụrụ ilu sị na Nwata bulie nna ya elu, ngwongwo na ngwogwo awụchie ya anya. Ya mere ndị Ọ bụ ngwogwo na ngwogwo ndị a ahụ bụ omenaala na Nkwuenye ndị Igbo ka ndị nchọchọ lebara anya na nchọcha ha ka ndị mmadụ mara etu omenaala na nkwenye si bụrụ njirimara ndị Igbo. Nchọcha a gbadoro ụkwụ bụ Inyocha omenaala na nkwenye ndị Igbo nke pụtara ihe n’akwụkwọ ejije “Nwata bulie nna ya elu” nke Inno Nwadike dere. Nke a bụ maka ndị igbo siri hụta omenaala ha na ka ha si nwe nkwenye n’ihe di iche iche pụtara n’agụmagụ a Nwata bulie nna ya elu nke Inno Nwadike dere. Odee gbasoro usoro sekọndịrị wee mee nchọcha ya majirikwa atụtụ Iche ọgụụ maka ihe o dere. Ihe nchọcha a nwere bụ Usoro anọ. Nke mbụ bụ ebe e nwere ntọala, mbunuche, uru, oke nchọcha, nhiahụ, usoro, ụdị nakwa nhazi nchọcha. Nke abụọ bụ ebe e mere ntulegharị agumagụ, ebe elebara anya n’ ọkpụrụkpụ isiokwu, ọrụ ndị emerela banyere isiokwu nakwa atụtụ nnyocha gbasoro. Nke atọ bụ ebe atụchara data e jiri rụọ ọrụ ya bụ omenala na nkwenye ndị pụtara ihe n’ejije “Nwata bulie nna ya elu”. Usoro anọ bụ ebe e mere nchọpụta Ihe ndị nchọcha chọpụtara bụ na e jị ejije a zie ozi mgbaghara ma mmadụ mejọọ mmadụ ibe ya. Nchọcha gosipụtara na ọ dị mkpa ikuziri ụmụakwụkwọ gbasara agụmagụ Igbo maka mmuta omenaala na nkwanye ha. Nchọcha gosipụtara na ejije Nwata bulie nna ya elu bụ agụmagụ rụrụ ọrụ ka enyo e jị ahụta ndụ, Omenaala na nkwenye ndị Igbo. Nchọpụta ọzọ gọsipụtara omenaala kachasi ndị Igbo mkpa dịka ekele, ile ọbia, ịgọ ọjị, ike ekpe/iri ekpe, Asụsụ na Ezinụlo. Nchọpụta gosiputara na ndị Igbo bụ ndị nkweyere na Chukwu ukwu na chi nta.
Keywords
Full Text:
PDFReferences
Akaeze, C. M. (2017). Elements of Igbo culture. Lecture note, Department of Linguistics, Igbo and other Nigerian Languages. University of Nigeria, Nsukka.
Chukwu, U. B. (2019). Nkwenye dị ka Ọ dị na nke m ji ka nke G. I. Nwozuzu dere. Arụmarụ B. A., Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjịrịa ndị ọzọ, Mahadum Naịjịrịa, Nsụkka
Ezeuko, R. O. (1981). Ewumewu, omenala, ofufe na nkwenye ndị Igbo. Onisha: Etukokwu Publishers (nig) Ltd.
Fafunwa, A. B. (1967). New perspective in African education. London: Macmillan.
Ikeokwu, E. S. & Onyejekwe, M. C. (2004). Mmalite ọmụmụ na nghọta ejije Igbo: Ọdịnaala na Ọlọrọohụụ. Enugu: CIDJAP Press.
Moody, H. I. B. (1968). Literary appreciation. London: Longman.
Ndunagum, U. H. (2016). Nnyocha ndịna na akanka n’ejije Ajọ obi nke G.I. Nwaozuzu Dere. Arụmarụ B. A., Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjịrịa ndị ọzọ, Mahadum Naịjịrịa, Nsụkka.
Nwadike, I. U. (1992). Ntoala agụmagụ. Nigeria: Ifunanya Publishers.
Nwadike, I. U. (1992). Nwata bulie nna ya elu. Nigeria: Ifunanya Publishers.
Ngara, E. (1982). Stylish Criticism and the Afriacan Friction. Ibadan: Heinemann.
Nzeakọ, J. U. T. (1972). Omenala ndị Igbo. Lagos: Longman Nigeria Plc.
Okebalama, C. N. (2003). Mkpọlite agụmagụ ọnụ Igbo. Enugu: Snaap Press.
Okorie, O. (2009). Omenaala na ewumewu ndị Igbo. Enugu: Cheston Agency.
Nze, A. I., na Imo, G. (2010). Nchikọta Akwụkwọ maka ule Sennio Sekondri (WASSCE 2011-2015) Nnewi: Mis-Fav. Publishers 23
Reeves, J. (1979). The Critical Sense. London : Heinemann.
Refbacks
- There are currently no refbacks.
Copyright (c) 2025 Priscilla Ebere Ugwuoke, PhD, Chikodi Dympna Onyegiri, PhD, Virginus Onyebuchi Aruah

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.
ISSN (Print): 2695-2319
ISSN (Online): 2695-2327

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.