ADỊMIKE AJỌ AKPARAMAGWA ỤMỤAKWỤKWỌ MAHADUM NAỊJIRỊA, NSỤKA NKE STETI ENUGWU NWERE N’ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO

Chinenye Anthonia Ezema, Peace Ebere Udensi

Abstract


Nchọcha a lebara anya n’adịmike ajọ akparamagwa ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjirịa, Nsụka nke Steti Enugwu nwere n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Ajụjụ nchọcha atọ ka eguzobere maka ọrụ nchọcha a. Ụdị nchọcha a bụ sọvee nkọwa. Ebe a nọ mee nchọcha kpọmkwem bụ na Mahadum Naịjirịa, Nsụka na Steti Enugwu. Ndị e ji mee nchọcha bụ ụmụakwụkwọ nọ afọ nke mbụ na nke abụọ bụ ndị na-eme ọmụmụ izuzugbe GSP 207 na GSP 208 dị puku asaa, narị asato na iri ise na asaa (7,857). E ji usoro pasenteji họrọ ụmụakwụkwọ dị puku abụọ, narị atọ na iri ise na asaa (2,357) bụ pasenti iri atọ ọnụọgụ ụmụakwụkwọ. Ụdị ngwa nchọcha e jiri mee nchọcha bụ ajụjụ njụmaaza dị iri abụọ na otu (21) n’ọnụọgụ nke isiokwu ya bụ Adịmike Ajọ Akparamagwa Ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjirịa, Nsụka nwere N’ọmụmụ Asụsụ Igbo (AAAỤMNNNAI). E ji usoro miin na ndịpu n’izugbe wee hazie nchọcha a. Nchọpụta gosiri na ajọ akparamagwa ụmụakwụkwọ nwere mmetụta dị ike n’ọmụmụ asụsụ Igbo na Mahadum Naịjirịa, Nsụka. Ụmụakwụkwọ anaghị enwe ezigbo mmasị n’ọmụmụ asụsụ Igbo n’ihi na ha na-eche na o nweghị uru ọbụla ọmụmụ asụsụ Igbo ga-abara ha na ndụ ha n’ọdịnihu. Nchọpụta gosikwara na ụmụakwụkwọ na-eme ihere ịbịa ọmụmụ asụsụ Igbo ihi na echiche ha bụ na o nweghị uru dị na ya. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ gosipụtara na ha anaghị aghọta ihe a na-akụzi n’oge ọmụmụ asụsụ Igbo, nke a bụ n’ihi na ha enweghị mmasị ịmuta ihe ọbụla a na-akụzi na ya. Ụmụakwụkwọ anaghị azụta akwụkwọ e dere n’asụsụ Igbo, nke a bụ akparamagwa ụmụakwụkwọ mụtara n’aka ndị nne na nna ha mere ka ha nwee akpọmasị n’ebe asụsụ Igbo nọ. Aro ndị nchọcha gbadoro ụkwụ na ka ndị isi n’ụlọakwụkwọ Mahadum na ndị nhazi ihe ọmụmụ dị n’aka kewapụta oge maka ọmụmụ asụsụ dịka ihe ọmụmụ izuzugbe (General Studies) na Mahadum Naịjirịa, Nsụka. A na-atụkwa aro ka ndị nne na nna na-asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo n’ụlọ bụ nke ga-eme ka ha nwee mmasị n’ịsụ na n’ịmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ Mahadum ọkachasị na Mahadum Naịjirịa, Nsụka; ka Gọọmenti Mahadum Naịjirịa, Nsụka mapụta otu ụbọchị n’afọ agụmakwụkwọ ọbụla iji na-akọwara ma na-akụzikwara ụmụakwụkwọ  mkpa ọ dị ịga na ịmụ ihe ọmụmụ izuzugbe ọkachasị n’asụsụ Igbo tinyere na ndị isi ụlọakwụkwọ kwesịrị iguzobe ihe nrite puru iche maka nwaakwụkwọ kacha mee nke ọma n’asụsụ Igbo kwa afọ ọbụla nakwazi inye ya ọrụ nkụzi ozugbo ọ gụchara akwụkwọ.


Keywords


Ajọ Akparamagwa, Mahadum, Ụmụakwụkwọ, Ọmụmụ Izuzugbe, Ọmụmụ Asụsụ Igbo

Full Text:

PDF

References


Anigbo, H. U. & Okoli, A. L. (2016). Ntọala asụsụ na ọgụgụ ederede Igbo. Nigeria: Longman.

Ebubechineke, I. (2020). Mmetụta ngwakọ asụsụ epum na asụsụ Bekee n’ikuzi sọm n’ụlọakwụkwọ praịmarị. In Ekwe jọnal nke ndị Igbo scholars forum, Nigeria. 13 (1). March, 2020. ISSN: 2476-8448. 1-23.

Eze, R. I. & Umo, C. U. (2021). Ụtọasụsụ na omenaala Igbo maka sinịọ sekọndịrị (Mbigharị). Lagos: Merit International Publishers.

Eze, R. I. (2020). Nka usoro nchọcha n’asụsụ Igbo. Nsukka: Chuka Educational Publishers.

Eze, R. I. (2022). Olu asụsụ ebe obibi ụlọ na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sekọndịrị sinịọ n’ịkpọpụta mkpụrụokwu asụsụ Igbo na zoon mmụta Agwu Steeti Enugwu. In Ideal international journal of Igbo scholars forum, Nigeria. 15 (2). July, 2022. ISSN: 2476-8421. 92-111.

Ezema, C. A. & Aboh, S. C. (2020). Mmetụta nsụmede n’iwu nsụpe n’ebe mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sekọndịrị nọ. In Ikenga international journal of Institute of African Studies. 21 (1 & 2). March, 2020. ISSN: 2006-4241. 110-117.

Ezema, C. A. & Obayi, J. I. (2020). Adịmire mmasị na nsụmede asụsụ Igbo n’ebe mmeta nke ọma ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ. In Ikoro journal of contemporary studies. 14 (1). March, 2020. ISSN: 0046-859-2. 78-84.

Ezema, C. A., Chineke, S. O. & Ude, F. U. (2021). Mmetụta olundịna mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sekọndịrị n’ule asụsụ Igbo na zoon mmụta Nsụka In Igbo scholars international journal of Igbo scholars forum, Nigeria. 14 (1). March, 2021. ISSN: 2476-843X. 138-152.

Federal Republic of Nigeria (2015). National policy on education (revised), Lagos: Federal Government Press.

Ilechukwu, D. I. & Iheme, J. O. (2018). Ụmụaka Igbo enweghị mmasị n’asụsụ Igbo: Mkpatara na mgbochi ya. Odezuruigbo jọnal, 2(1), 168-182.

Kind, P. M., Jones, K. & Barmby, P. (2007). Developing attitudes towards science measures. International journal of science education. 29(7), 871-893.

Nwadike, I. U. (2008). Igbo language in education: An historical study. Uruowulu - Obosi: Pacific Publishers.

Nwigwe, N and Ekwenze, C (2017). Mwulite nka okwukwu nye ụmụ akwụkwụ na-amụ Igbo dịka asụsụ epum (Igbo L1): Ntụta aro ụfọdụ. Journal of linguistics, language and culture, Vol 4(1)

Nworgu, B. G. (2015). Educational research basic issues and methodology. Ibadan: Wisdom Publishers Ltd.

Nwozuzu, G. I. (2015). Agbambọ ndị Igbo na nkwalite asụsụ na omenala ha. A paper presented at the 9th Chief Ọgbalụ memorial lecture held at Nnamdi Azikiwe University, Awka

Sapir, E. (2021). Language. Berkeleky: University of California Press.

Udensi, P.E (2009). Ọnọdụ asụsụ Igbo na-ebe o metụtara amụmamụ 6-3-3-4. Undergraduate project, Department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka.

Ugwuoke, P. E, Eze, R. I, & Akaeze, C. M (2021). Itule na ikuzi omenaala alụmalụ ndị Igbo site n’agụmagụ Udokamma n’ogo sekọndịrị nta. In Intenational Sapienta Global Journal of Arts, Humanities and Development (SJOJAHDS) 4(2).


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2025 Chinenye Anthonia Ezema, Peace Ebere Udensi

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 ISSN (Print):   2695-2319

ISSN (Online): 2695-2327

 

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.