ỌZỤZỤ NKWỤDOSIKE NDỊ NKUZI MAKA AGỤMAKWỤKWỌ ỌRỤ NKA N’ASỤSỤ IGBO N’ỤLỌAKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ NA MPGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ NAỊJIRỊA
Abstract
Nchọcha a lebara anya na ọzụzụ nkwụdosike ndị nkuzi maka agụmakwụkwọ ọrụ nka n’asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Mbunuche nchọcha a bụ ịmata alaka ọmụmụ asụsụ Igbo e kwesiri inye ndị nkụzi ọzụzụ nay a tinyere ụdị ọrụ nka a tụrụ anya na ha ga-enyefe n’aka ụmụakwụkwọ. Ajụjụ nchọcha abụọ ka e ji wee mee nchọcha a. Onye nchọcha gbasoro usoro nkọwa sọvee wee mee nchọcha ya. E ji usoro nhọrọ nha na usoro nhọrọ ebumnobi wee họpụta ndị nkuzi asụsụ Igbo dị iri asaa e ji mee nchọcha. Ngwa e jiri mee nchọcha a bụ njụmaza bụ nke ihe e depụtara na ya dị iri na anọ (14) n’ ime nkeji abụọ. Maka inyocha ngwa nchọcha, ndị nkụzi abụọ na ngalaba amụmamụ Igbo na otu onye nkụzi na-akụzi na ngalaba measurement na evaluation lebara anya na ya, bụ ndị a si na ngalaba mahadum nke Naịjirịa Nsukka. Onye nchọcha lelere ịnọgide n’ọnọdụ nke agbanweghị agbanwe site n‘iji usoro ntụcha data a na-akpọ Cronbach‘s Alpha na Bekee, ma e nwetara akara 0.82. E jiri ntụcha mini, ndịpụ n‘izugbe wee nweta ọsịsa ajụjụ nchọcha. Nchọcha e mere gosiri na alaka ihe ọmụmụ e kwesiri inye ndị nkụzi ọzụzụ na ya gụnyere ọzụzụ gbasara omenala Igbo na akara njiri mara ndị Igbo, n’asụsụ Igbo n’agụmagụ Igbo, na nka e ji eso aka ọrụ ndị Igbo na azụmahịa, usoro na nka nkuzi ọhụrụ e kwesiri iji wee kụzie asụsụ Igbo na ndị ọzọ. Nchọpụta ọzọ gosiri na ụdị ọrụ nka e kwesiri inyefe n’aka ụmụakwụkwọ gụnyere ime ka mata ihe gbasara ọrụ nka akparakpa na apịrịapị ndị Igbo, ịmụta etu e si esi nri ndị Igbo nakwa ụdị ofe ndị Igbo, ịmụta ihe gbasara ịgụ, ịkụ maọbụ ịgba egwu omenala na ọdịnala ndị Igbo, ịmụta ihe gbasara asụsụ Igbo, nka okwu, ilu na akpalaokwu. Onye nchọcha tụtara alo mkpa ọ dị ndị gọvmentị ịhụ na ndị na- ahazi korikulum Igbo ga- agba mbọ wepụta ohere ebe ụmụakwụkwọ ga- amụ ọrụ nka ọdịnala Igbo, ma nye nkwado ya n’ụdị ego nakwa inye ndị nkụzi ọzụzụ kwesiri ịnata maka ya na ndị ọzọ.
Keywords
Full Text:
PDFReferences
Adebayo, A. (2017). Entrepreneurship education and youth empowerment in Nigeria. Journal of Youth Studies, 20(1), 1-12.
Agu, C. (2019). Igbo language and culture: A study of the impact of globalization. Journal of Language and Culture, 8(1), 1-10.
Aina, O. (2016). Entrepreneurship education in Nigeria: Challenges and prospects. Journal of Entrepreneurship Education, 19(2), 1-12.
Chukwu, O. (2018). Entrepreneurship education and economic development in Nigeria. Journal of Economic Development, 23(1), 1-12.
Eze, U. (2017). Igbo language teaching and learning in Nigeria: A review of the literature. Journal of Language and Linguistics, 16(2), 1-15.
Federal Republic of Nigeria (2014) national policy on education revised (4th edition) Abuja, NERDC Press.
Ilo, L. (2021). Capacity building strategies. Retrieved from http://www.google.com.
Ikedioha, K. (2018). Reforms for capacity building of language teachers. Retrieved from http://www.google.com.
Lackéus, M. (2015). Entrepreneurship education: A systematic review. Journal of Entrepreneurship Education, 18(1), 1-18.
Nworgu, B. G. (2006). Educational research, basic issues and methodology. Nsukka, Enugu: University Trust Publishers.
Okeke, C. (2018). Igbo language teaching in Nigeria: Challenges and prospects. Journal of Language and Linguistics, 17(3), 1-15.
Uba, P. (2018). Need for language teachers training. Retrieved from http://www.google.com.
UNESCO (1999): World Education Report Teachers and Learning in a Changing World. Paris: UNESCO.
UNESCO (2002): Teacher Education Guidelines: Using Open and Distance Learning Technology, Curriculum, Cost, Evaluation. Paris: UNESCO.
Williams, N. I. (2011). In-service education of teachers: problems and prospects. Retrieved from http://www.vneụpress.net/NG-BG1625.
Refbacks
- There are currently no refbacks.
Copyright (c) 2025 Gloria Ngozi Ugbor, Uju Clara Umo

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.
ISSN (Print): 2695-2319
ISSN (Online): 2695-2327
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.