AHAGHỊ OTU NKE JENDA NA NJIKỌTA ỌNỤ NKE MBA NIILE: ỌKACHASỊ N’OKPURU ỌCHỊCHỊ BENDE NA STEETI ABỊA
Abstract
Ihe ọmụmụ a bụ maka ahaghị otu nke jenda na njikọta ọnụ nke mba niile ọkachasị n’okpuru ọchịchị Bende nke Steeti Abịa. Jenda bụ nkọwa doro ọha mmadụ anya banyere njirimara nwoke na nwaanyị. Anaghị akọwa jenda n’usoro ndụ n’ihi ihe e jiri mara nwoke maọbụ nwaanyị mana e ji ihe doro ọha mmadụ anya akọwa jenda. Ọ bụ iwu a haziri ahazi zuru ọha ọnụ ma oge ụfọdụ na-achịkwa usoro mmepụta na mmepụtakwa, nkesa na oriri n’ụzọ ọrụ ọ na-arụ. Ihe gbasara jenda na-agbakwasi ụkwụ na mmekọrịta dị n’etiti nwoke na nwaanyị, ọrụ ha na-arụ, ụzọ mbanye, nakwa njikwa n’ihe gbasara akụ na ụba, ike ọrụ, mmasị na mkpa. Ahaghị otu nke jenda pụtara echiche na ụzọ e si egosịpụta na nwoke na nwaanyị ahaghị otu. Ọ na-egosịpụta site n’akpamoke, ma nke pụtara ihe ma nke ọha mebere. Ụmụnwaanyị na-anọkarị n’azụ ụmụnwoke n’ọtụtụ ihe dị iche iche tinyere agụmakwụkwọ, ịchọ ọrụ, ebe a na-achọ ohere dị iche iche na nnọchị anya n’ebe ọchịchị nọ. Ahaghị otu nke jenda bụ ihe juru ebe niile n’ala anyị. Iji gabiga nsogbu nke a, obodo kwesịrị ileba ya anya. Mbunuche ihe ọmụmụ a bụ ileba anya n’etu ahaghị otu nke jenda si emetụta ndị bị n’okpuru ọchịchị Bende nke Steeti Abịa. Ihe a chọpụtara gosịrị na anaghị emesa ụmụnwaayị omume etu e si emesa ndị nwoke n’ụzọ nhataha n’obodo. Ahụghị ụmụnwaanyị dịka ndị dị mkpa n’obodo kama a na-ahụ ha dịka ndị a ga-ahụ anya ọ bụghị ndị a ga-anụ olu ha. Nke a na-emetụta mmpe obodo na njikọta aka ọnụ nke mba niile. Ndị nchọcha tụnyere arọ na e kwesịrị inwe jenda ha otu nke ga-enye onye ọbụla nọ n’obodo ohere ịha otu n’ụzọ dị iche iche dịka ọrụ, agụmakwụkwọ na ndị ọzọ. Ụzọ dị etu a ga-eweta mmepe n’obodo anyị nakwa ala anyị niile.
Keywords
Full Text:
PDFReferences
Aguene, I.N (1999). Contemporary Social Problems. Nsukka: Prize Publishers Allyn & Bacon.
Ajolor, R. (2014). What is the National Development? www.slideshar.net>ricoalolor>what-is-the...
Azikiwe, U. (1992) “Gender Issues and the Universal Basic Education (UBE) Programme. Paper Presented for the Semina on Universal Basic Education. Faculty of Education, University of Nigeria, Nsukka. July 3-7.
Beauvoir, S. (1989). The Second Sex. www.amazon.com
Bello-Imam, I.B (1987). Problems of National Integration in Nigeria. Ind. J. Pol. Sci. XLVIII: 2: 260-281.
Bhawna, B. (2016). National Development: Meaning and Problems. http:/www. yourarticlelibrary.com/society/national-development-meaning-and-problems/76824/.and-problems/76824/
Coleman, J.S & Rosberg, C.G. Jr. (1964). Political Parties and National Integration in Tropical Africa. Berkeley: University of California Press.
Eitzen, D. & Baca-Zinn, M. (2003). Social Problem: Gender Inequality. Bonton:
Enaruna, E. (2014). National Integration, Citizenship, Political Participation and Democratic Stability in Nigeria. An International Journal of Arts and Humanities. 3(3).
FAO (1997). What is Gender? www.fao.org
Gberevbie, D.E. Oshibanjo, A.O., Adeniji, A.A. & Oludajo, O.A. (2014). An Empirical Study of Gender Discrimination and Employee Performance among Academic Staff of Government Universities in Lagos State. Nigeria International Journal of Social, Human Science and Engineering. 8(1). Pp. 101-109.
Gupta, G.R. (2000). Gender, Sexuality and HIV/AIDS: That what, the why and the how www.pubmed.ncbi.nlm.nih.grv>...
Human Development Reports (2018). Gender Inequality Index: www.hdr:undp.org>c-onte-nt>gender-inequality-index:
Jackson, R.M. (2018). What Causes Gender Inequality: http://www.ny_u.edu/classes/j-ackson/causes-of-gender-inequality.
Jacob & Tenue (1964). National Integration, Citizenship, Political Participation. www.ajol.info>index.php>ijah>article>view.
Lawal, T. & Oluwatoyin, A. (2011). National Development in Nigeria Issues, Challenges and Prospects. Journal of Public Administration and Policy Research. 3(9): 237-241.
Nwakoby (2003). The Position of Women in Ubesie’s Novel. M.A. Project, Development of Linguistics, Igbo and other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka.
Ojo. E.O. (2009). Mechanism of National Integration in a Multi-ethnic Federal State. The Nigerian Experience. Ibadan: John Archer Publishers Ltd.
Quentin, B. (2008). The Effect of Gender Inequality on Growth: A Cross-country Empirical Study. The Park Place Economist 16(1).
Quibria. M.G. (1993). Gender and Poverty: Issues and Policies with Special References to Asian Developing Countries. Wiley Online Library. Onlinelibrary.wiley.com.
Refbacks
- There are currently no refbacks.
Copyright (c) 2025 ChriBridget Ogechi Dioka, Peace Ebere Udensi, PhD, Joy Ifeadikanwa Obayi, PhD

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.
ISSN (Print): 2695-2319
ISSN (Online): 2695-2327
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.