NTỌSASỊ AHA ‘NWA’ DỊKA O SIRI METỤTA ASỤSỤ NA OMENALA IGBO
Abstract
N’ebe ndị Igbo nọ, onye a mụtara ji ụgwọ ịmụta ibe ya. Ọmụmụ bụ ihe na-ame ka ụwa na-abasa. Nchọpụta na-egosi na ụfọdụ ndị ntorobịa ugbu a, ọ kachasị ndị na-eche na ha hụrụ uzo karịsịa ndị ọzọ na-agbasozi omenala dị anya n’ebe nke ndị Igbo nọ, site n’igosi na ‘nwa/ụmụ’ abụchaghịzị ihe kacha mkpa n’ezinaụlọ. Ụfọdụ ndị mụtara amụta enwekwaghị ohere ileru ha anya na inye ha ọzụzụ kwesiri ekwesi ka ha were bụrụ ụmụafọ Igbo n’ezie. Ọ bụ ụmara ụfọdụ ndị a kpalitere mmụọ ndị omenchọcha a ileru anya n’ọnọdụ ‘nwa/ ụmụ’n’ebe asụsụ na omenala Igbo dị. Agụgụala na usoro obibindụ ndị Igbo na-apụta ihe n’aha ha na-agụ ụmụ ha. Nke a mere ndị omenchọcha a jiri kpebie ileru anya n’ahaaka metụtara ‘nwa’, iji chọpụta ọnọdụ ‘nwa’ na ndụ ndị Igbo. Ndị omenchọcha a nwetere njiede ha jiri mee nchọcha a site n’aha ụmụakwụkwọ ha na-akuziri na Mahadum Legọọsị dekọtara, tinyekwuoro ndị ha mabu dịka ndị Igbo. Nchọpụta gosiri na ndị Igbo dobere ‘nwa/ụmụ’ n’ọkwa dị ezi elu. Ọ bụghị naanị na ọ bụ ụmụ ha na-eleru ha anya n’agadi mana ọ bụ ha na-anọchi anya ha ma ha nwụọ nke ga-eme ka ama ha ghara ichi. Ndị Igbo hụrụ ‘nwa /ụmụ’ dịka nnukwu akụ onye ọbụla kwesiri ịkpata.
Keywords
Full Text:
PDFReferences
Emeka-Nwobia, N. Dynamics of Onomastic in Afikpo Igbo Society. Research on Humanities and Social Sciences.Vol. 6. (12). (2016):95-103. (retrieved on 18/1/2017).
Mataebere Iwundu, Procreation and the Igbo Thought Through Names, Igede Igbo.Vol. 1. (1). 2000.
Nzeakọ, Tagbo, Omenala Ndi Igbo. Onitsha: University Press, 1976.
Ogbalu, Chidozie, Omenala Igbo. The book of Igbo Customs. Lagos. Academy press, 1979.
Ofomata, Chinedum, Omenala na Odinala Ndi Igbo. Enugu: Format Publishers, 2012.
Okafor, Emeka & T. Inyiama, Igbo Personal and Title Names. Enugu: New Generation Books, 2008.
Onukawa, Monday Chibudo, An Anthropolinguistic Study of Igbo Market-Day Anthroponyms. Journal of African Cultural Studies Vol.11 (1). 1998.
Onukawa, Monday Chibudo, Anthropolinguistic Evidence of the Evolution of Chi Names. Igbo Journal of Asian and African Studies, (58) 1991.
Onukawa, Monday Chibudo, Kwe-Names and the Complementary Dual Concepts in Igbo.Igede: Journal of Igbo Studies, 2000.
Onukawa, Monday Chibudo, Death A Male-Specific Concept in Igbo Gender Naming. Lore and Language: Journal of the National Centre for English Cultural Tradition. Vol 17. (2). 2003.
Onukawa, Monday Chibudo “Gịnị bụ aha Gị: Topical Issues on Personal Naming in the Igbo Society.” Inaugural Lecture of Abia State University, 24th August, 2016.
Oyeka, Chiamaka, Sexism in Names: A Critical Analysis of Male and Female Names in the Traditional Igbo Society. Ideal International Journal of Igbo Scholars Forum, Nigeria. Vol. 4(1), 2017.
Ụbahakwe, Ebo, Igbo Names: Their Structure and Meaning. Ibadan: Day Star, 1981.
Ụbahakwe, Ebo, Culture Content of Igbo Personal Names. C. Ogbalụ and E Emenanjo (Eds.) Igbo Language and Culture. Ibadan: University Press, 1982.
Ubesie, Tony Uchenna, Odinala Ndi Igbo. Ibadan: Oxford University Press.
Refbacks
- There are currently no refbacks.
Copyright (c) 2023 Chiamaka Ngozi Oyeka, Adaora Lois Anyachebelu

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.
ISSN (Print): 2695-2319
ISSN (Online): 2695-2327
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.